15Ọ zara sị, “Dịka ị maara, ọ bụ m nwe alaeze a. Ndị Izrel niile lekwara anya na m ga-abụ eze ha. Ma otu ọ dị, ihe niile adịghịkwa ka ọ dị na mbụ, alaeze a aghọọla nke nwanne m, nʼihi na o si nʼaka Onyenwe anyị rute ya aka.
16Ugbu a, enwere m otu ihe m na-arịọ nʼaka gị. Biko ajụkwala imere m ya.” Batsheba sịrị ya, “Gịnị bụ arịrịọ gị? Kwuo ihe ọ bụ.”
17Ọ zaghachiri ya sị, “Biko rịọrọ m Solomọn eze, nʼihi na amaara m na ọ ga-eme ihe ọbụla ị rịọrọ ya, ka ọ kpọnye m Abishag, nwanyị Shunem ahụ, ka ọ bụrụ nwunye m.”
18Batsheba zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m agwara gị eze okwu.”
19Emesịa, Batsheba bịakwutere eze Solomọn ịgwa ya okwu banyere Adonaịja. Mgbe ọ na-abata, eze sitere nʼocheeze ya bilie gaa izute ya, kpọkwaa isiala nye ya nọdụ ala nʼocheeze ya. O mere ka e butere nne eze ocheeze, ọ nọdụkwara ala nʼaka nri ya.