20Ọ sịrị, “Enwere m arịrịọ nta m chọrọ ịrịọ gị. Ajụkwala i mere m ya.” Eze zaghachiri, “Rịọọ ya nne m. Agaghị m ajụ i mere gị ya.”
21Ya mere ọ sịrị, “Biko, kwere ka enye nwanne gị nwoke Adonaịja Abishag nwanyị Shunem, ka ọ bụrụ nwunye ya.”
22Eze Solomọn zara nne ya sị, “Gịnị mere i ji rịọọ m ka m nye Adonaịja naanị Abishag nwanyị Shunem ka ọ bụrụ nwunye ya? Ị gaara arịọkwa m sị m nye ya alaeze m. Nʼihi na ọ bụ ya tọrọ m” Ị gaara arịọkwa nʼihi Abịata onye nchụaja ma Joab nwa Zeruaya.
23Mgbe ahụ, eze Solomọn ji Onyenwe anyị ṅụọ iyi sị, “Ka Chineke mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na Adonaịja ejighị ndụ ya kwụọ ụgwọ nʼihi arịrịọ a.
24Ugbu a, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ mere ka m nọgidesie ike nʼocheeze nna m Devid, onye mere ka ọchịchị eze m malite dịka o kwere na nkwa, a ga-eme ka Adonaịja nwụọ taa.”