1 Ndị Eze 20

Nʼoge a, otu onye amụma bịakwutere Ehab, bụ eze Izrel sị, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, ‘Ị hụrụ oke igwe ndị agha a? Aga m enyefe ha nʼaka gị taa, mgbe ahụ ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”

1 Kings 20:13 (UKJV) And, behold, there came a prophet unto Ahab king of Israel, saying, Thus says the LORD, Have you seen all this great multitude? behold, I will deliver it into yours hand this day; and you shall know that I am the LORD.

11Ma eze Izrel zaghachiri, “Gwa ya, ‘Onye na-ebu agha na-anya isi naanị mgbe a lụchara agha, ọ bụghị tupu a lụọ agha.’ ”

12Ben-Hadad nụrụ ozi Ehab ziri mgbe ya na ndị eze ndị ọzọ ahụ nọ na-aṅụ mmanya nʼụlọ ikwu ha manyere nʼọgbọ agha ahụ. Ben-Hadad nyere ndị agha ya iwu sị ha, “Jikerenụ, buso ndị Izrel agha.” Ya mere, ha kwadoro ibuso obodo ahụ agha.

13Nʼoge a, otu onye amụma bịakwutere Ehab, bụ eze Izrel sị, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, ‘Ị hụrụ oke igwe ndị agha a? Aga m enyefe ha nʼaka gị taa, mgbe ahụ ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”

14Ma Ehab jụrụ sị, “Onye ga-eme nke a?” Onye amụma zara, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ọ bụ ụmụ okorobịa bụ ndịisi agha nọ nʼokpuru ndị ọchịagha na-achị akụkụ ala Izrel.’ ” Ehab jụkwara ọzọ, “Onye ga-amalite agha a?” Onye amụma ahụ zara, “Gị onwe gị.”

15Mgbe ahụ, Ehab kpọkọtara ụmụ okorobịa bụ ndịisi agha si nʼakụkụ obodo ya. Ọnụọgụgụ ha dị narị abụọ na iri atọ na mmadụ abụọ. Ọnụọgụgụ ndị agha Izrel ndị ọzọ dị puku asaa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.