1 Ndị Eze 20

Ọ sịrị, “Ọ bụrụ na ha abịa nʼihi udo, jidenụ ha na ndụ; ọ bụrụ na ha bịara maka ibu agha, jidenụ ha na ndụ!”

1 Kings 20:18 (UKJV) And he said, Whether they be come out for peace, take them alive; or whether they be come out for war, take them alive.

16Nʼetiti ehihie, mgbe Ben-Hadad na iri ndị eze atọ na abụọ ahụ, bụ ndị ahụ bịara inyere ya aka nọ na-aṅụ mmanya, na-aṅụbiga ya oke,

17ụmụ okorobịa, bụ ndị agha, ndị nọ nʼokpuru ndị ọchịagha na-achị akụkụ ala Izrel buru ụzọ pụọ ibu agha. Ma Ben-Hadad, nʼonwe ya ezipụlarị ndị nledo, ndị lọghachiri bịa gwa ya sị, “Ndị agha si Sameria na-abịa.”

18Ọ sịrị, “Ọ bụrụ na ha abịa nʼihi udo, jidenụ ha na ndụ; ọ bụrụ na ha bịara maka ibu agha, jidenụ ha na ndụ!”

19Ma ụmụ okorobịa ndị ọchịchị a bụ ndị nọ nʼokpuru ndịisi, na-achị akụkụ ala ahụ sitere nʼobodo zọlie ije ebe ndị agha so ha nʼazụ, pụọ ibu agha.

20Onye ọbụla nʼime ha gburu onye agha Siria ọbụla lụsoro ya ọgụ. Nke a mere ka ndị agha Siria gbapụ ọsọ, ndị agha Izrel chụsokwara ha. Ma Ben-Hadad, eze Aram, na ndị agha na-agba ịnyịnya, sitekwara nʼihu ọgbọ agha ahụ gbapụkwa ọsọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.