1 Ndị Eze 20

Mgbe otu afọ gasịrị, Ben-Hadad chịkọtakwara ndị Aram niile duru ha gaa Afek ibuso Izrel agha.

1 Kings 20:26 (UKJV) And it came to pass at the return of the year, that Benhadad numbered the Syrians, and went up to Aphek, to fight against Israel.

24Mee ihe a, wepụ ndị eze a niile site nʼebe ha nọ, jiri ndị na-achị ala gbanwee ha.

25Kpọkọtaakwa ndị agha ọzọ, ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka ndị agha i du gaa agha na mbụ. Nyekwa anyị ịnyịnya na ụgbọ agha ga-ezuru anyị. Anyị ga-apụkwa buso ndị Izrel agha nʼobosara ala dị larịị. Ọ dịkwaghị ihe ga-egbochi anyị imeri ha nʼoge a.” Ben-Hadad, eze Aram, kwenyere, meere ha dịka ha rịọrọ ya.

26Mgbe otu afọ gasịrị, Ben-Hadad chịkọtakwara ndị Aram niile duru ha gaa Afek ibuso Izrel agha.

27Mgbe a kpọkọtara ndị agha niile nọ nʼIzrel nye ha ngwa agha, ha pụrụ izute ha. Ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu ha na ncherita ihu ndị agha Siria, dịka igwe ewu nta abụọ, ebe ndị Aram jupụtara ala ahụ niile.

28Onye nke Chineke bịara gwa eze ndị Izrel, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, ‘Nʼihi na ndị Aram na-eche na Onyenwe anyị bụ chi nke ugwu, na ọ bụghị chi ala ndagwurugwu, aga m arara igwe ndị agha a nyefee gị nʼaka, ka gị na ndị gị mata nʼeziokwu na m bụ Onyenwe anyị.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.