26Mgbe otu afọ gasịrị, Ben-Hadad chịkọtakwara ndị Aram niile duru ha gaa Afek ibuso Izrel agha.
27Mgbe a kpọkọtara ndị agha niile nọ nʼIzrel nye ha ngwa agha, ha pụrụ izute ha. Ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu ha na ncherita ihu ndị agha Siria, dịka igwe ewu nta abụọ, ebe ndị Aram jupụtara ala ahụ niile.
28Onye nke Chineke bịara gwa eze ndị Izrel, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, ‘Nʼihi na ndị Aram na-eche na Onyenwe anyị bụ chi nke ugwu, na ọ bụghị chi ala ndagwurugwu, aga m arara igwe ndị agha a nyefee gị nʼaka, ka gị na ndị gị mata nʼeziokwu na m bụ Onyenwe anyị.’ ”
29Ọ bụ ụbọchị asaa ka ha mara ụlọ ikwu ha na ncherita ihu ibe ha. Ma nʼụbọchị nke asaa ahụ, ndị agha malitere ibu agha. Ndị Izrel merụrụ narị puku ndị agha Aram ahụ nʼotu ụbọchị.
30Ma ndị fọdụrụ nʼetiti ndị agha Aram gbapụrụ ọsọ gbalaga nʼobodo Afek. Ebe ahụ ka mgbidi obodo Afek nọ dagbuo iri puku ndị agha abụọ na asaa nʼime ha. Ma Ben-Hadad nʼonwe ya gbalagara, gbaba nʼime obodo ahụ, gaa zoo onwe ya nʼime ime otu ụlọ.