1 Ndị Eze 20

Ma ndị fọdụrụ nʼetiti ndị agha Aram gbapụrụ ọsọ gbalaga nʼobodo Afek. Ebe ahụ ka mgbidi obodo Afek nọ dagbuo iri puku ndị agha abụọ na asaa nʼime ha. Ma Ben-Hadad nʼonwe ya gbalagara, gbaba nʼime obodo ahụ, gaa zoo onwe ya nʼime ime otu ụlọ.

1 Kings 20:30 (UKJV) But the rest fled to Aphek, into the city; and there a wall fell upon twenty and seven thousand of the men that were left. And Benhadad fled, and came into the city, into an inner chamber.

28Onye nke Chineke bịara gwa eze ndị Izrel, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, ‘Nʼihi na ndị Aram na-eche na Onyenwe anyị bụ chi nke ugwu, na ọ bụghị chi ala ndagwurugwu, aga m arara igwe ndị agha a nyefee gị nʼaka, ka gị na ndị gị mata nʼeziokwu na m bụ Onyenwe anyị.’ ”

29Ọ bụ ụbọchị asaa ka ha mara ụlọ ikwu ha na ncherita ihu ibe ha. Ma nʼụbọchị nke asaa ahụ, ndị agha malitere ibu agha. Ndị Izrel merụrụ narị puku ndị agha Aram ahụ nʼotu ụbọchị.

30Ma ndị fọdụrụ nʼetiti ndị agha Aram gbapụrụ ọsọ gbalaga nʼobodo Afek. Ebe ahụ ka mgbidi obodo Afek nọ dagbuo iri puku ndị agha abụọ na asaa nʼime ha. Ma Ben-Hadad nʼonwe ya gbalagara, gbaba nʼime obodo ahụ, gaa zoo onwe ya nʼime ime otu ụlọ.

31Mgbe ahụ, ndịisi agha ya bịakwutere ya sị ya, “Lee, anyị nụrụ na ndị eze Izrel bụ ndị obi ebere. Ka anyị yiri akwa mkpe nʼukwu anyị, kee ụdọ nʼolu anyị, gaa rịọọ eze Izrel. Ma eleghị anya ọ ga-edebe gị ndụ.”

32Ya mere, ha yikwasịrị onwe ha akwa mkpe, nyarakwa ụdọ nʼolu ha, jekwuru eze Izrel sị ya, “Ohu gị bụ Ben-Hadad na-asị, ‘Biko, kwee ka m dịrị ndụ.’ ” Eze jụrụ ha sị, “Ọ bụ ezie na ọ ka dị ndụ ugbu a? Nwanne m ka ọ bụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.