21Ọ sịrị, ‘Aga m eme ka ihe ọjọọ dakwasị gị. Aga m ekpochapụ ndị agbụrụ gị, site nʼezinaụlọ Ehab bipụ nwoke ọbụla, maọbụ ohu maọbụ onyenwe onwe ya nʼIzrel.
22Aga m eme ka ụlọ gị dịrị ka nke Jeroboam nwa Nebat, na dịka nke Baasha nwa Ahija, nʼihi na ị kpasuola m iwe, meekwa ka Izrel mehie.’
23“Ma banyere Jezebel, Onyenwe anyị sịrị, ‘Ụmụ nkịta ga-eri anụ ahụ Jezebel nʼakụkụ mgbidi aja ụlọ dị nʼobodo Jezril.’
24“Nkịta ga-eri anụ onye ọbụla si nʼezinaụlọ Ehab nke nwụrụ nʼime obodo, ma anụ ufe nke eluigwe ga-eri anụ ndị ọbụla nwụrụ nʼọhịa.”
25(Nʼezie, o nweghị onye ọbụla ọzọ dị ka Ehab, onye rere onwe ya nye ime ihe ọjọọ dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, onye Jezebel nwunye ya kwagidere ime ihe ọjọọ dị iche iche.