1 Ndị Eze 21

“Nkịta ga-eri anụ onye ọbụla si nʼezinaụlọ Ehab nke nwụrụ nʼime obodo, ma anụ ufe nke eluigwe ga-eri anụ ndị ọbụla nwụrụ nʼọhịa.”

1 Kings 21:24 (UKJV) Him that dies of Ahab in the city the dogs shall eat; and him that dies in the field shall the fowls of the air eat.

22Aga m eme ka ụlọ gị dịrị ka nke Jeroboam nwa Nebat, na dịka nke Baasha nwa Ahija, nʼihi na ị kpasuola m iwe, meekwa ka Izrel mehie.’

23“Ma banyere Jezebel, Onyenwe anyị sịrị, ‘Ụmụ nkịta ga-eri anụ ahụ Jezebel nʼakụkụ mgbidi aja ụlọ dị nʼobodo Jezril.’

24“Nkịta ga-eri anụ onye ọbụla si nʼezinaụlọ Ehab nke nwụrụ nʼime obodo, ma anụ ufe nke eluigwe ga-eri anụ ndị ọbụla nwụrụ nʼọhịa.”

25(Nʼezie, o nweghị onye ọbụla ọzọ dị ka Ehab, onye rere onwe ya nye ime ihe ọjọọ dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, onye Jezebel nwunye ya kwagidere ime ihe ọjọọ dị iche iche.

26Ehab bụ onye mere mmehie dị oke njọ nke ịgbaso na ife arụsị dị iche iche ofufe dịka ndị Amọrait mere, bụ ndị ahụ Onyenwe anyị sitere nʼala a chụpụ ime ka ndị Izrel nweta ala ha.)

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.