33ndị ọchịagha, na-achị ndị na-agba ụgbọ agha hụrụ na ọ bụghị eze Izrel, ma kwụsị ịchụso ya.
34Ma otu onye dọrọ ụta ya gbapụ ya na-ebughị onye ọbụla nʼobi, gbata ya eze Izrel nʼetiti njikọ nke uwe agha ya. Eze gwara onye ọkwọ ụgbọ agha ya, sị, “Tụgharịa, si nʼebe a bupụ m, nʼihi na emerụọla m ahụ.”
35Agha ahụ siri ike nʼụbọchị ahụ niile, e ji ihe mee ka eze kwụrụ ọtọ nʼime ụgbọ agha ya na-eche ndị Aram ihu. Ọbara si nʼọnya ahụ sọjuru nʼala ụgbọ agha ahụ, ọ nwụrụ nʼuhuruchi ụbọchị ahụ.
36Mgbe anyanwụ na-ada, e tiri mkpu nke gazuru nʼọgbọ agha ndị Izrel, sị, “Nwoke ọbụla laa nʼobodo ya, onye ọbụla laakwa nʼala nke aka ya!”
37Ya mere, eze nwụrụ, e buta ozu ya nʼobodo Sameria, ebe a nọ lie ya.