1 Ndị Eze 22

Mgbe anyanwụ na-ada, e tiri mkpu nke gazuru nʼọgbọ agha ndị Izrel, sị, “Nwoke ọbụla laa nʼobodo ya, onye ọbụla laakwa nʼala nke aka ya!”

1 Kings 22:36 (UKJV) And there went a proclamation throughout the host about the going down of the sun, saying, Every man to his city, and every man to his own country.

34Ma otu onye dọrọ ụta ya gbapụ ya na-ebughị onye ọbụla nʼobi, gbata ya eze Izrel nʼetiti njikọ nke uwe agha ya. Eze gwara onye ọkwọ ụgbọ agha ya, sị, “Tụgharịa, si nʼebe a bupụ m, nʼihi na emerụọla m ahụ.”

35Agha ahụ siri ike nʼụbọchị ahụ niile, e ji ihe mee ka eze kwụrụ ọtọ nʼime ụgbọ agha ya na-eche ndị Aram ihu. Ọbara si nʼọnya ahụ sọjuru nʼala ụgbọ agha ahụ, ọ nwụrụ nʼuhuruchi ụbọchị ahụ.

36Mgbe anyanwụ na-ada, e tiri mkpu nke gazuru nʼọgbọ agha ndị Izrel, sị, “Nwoke ọbụla laa nʼobodo ya, onye ọbụla laakwa nʼala nke aka ya!”

37Ya mere, eze nwụrụ, e buta ozu ya nʼobodo Sameria, ebe a nọ lie ya.

38Ha sachara ụgbọ agha ya nʼọdọ mmiri dị na Sameria (ebe ndị akwụna na-asa ahụ). Ụmụ nkịta rachara ọbara ya, dịka okwu Onyenwe anyị kwubiri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.