1 Ndị Eze 3

Nʼoge ahụ, ndị Izrel ka na-achụ aja ha nʼebe dị elu niile, nʼihi na ewubeghị ụlọnsọ ukwu nye aha Onyenwe anyị.

1 Kings 3:2 (UKJV) Only the people sacrificed in high places, because there was no house built unto the name of the LORD, until those days.

1Solomọn na Fero eze Ijipt jikọtara onwe ha nʼotu, ọ lụrụ nwa nwanyị Fero. Ọ kpọbatara ya nʼobodo Devid ruo mgbe o wusiri ụlọeze ya na ụlọnsọ Onyenwe anyị, na mgbidi gbara Jerusalem gburugburu.

2Nʼoge ahụ, ndị Izrel ka na-achụ aja ha nʼebe dị elu niile, nʼihi na ewubeghị ụlọnsọ ukwu nye aha Onyenwe anyị.

3Ma Solomọn gosiri ịhụnanya nʼebe Onyenwe anyị nọ, site na ịgbaso ntụziaka niile nke Devid nna ya nyere ya, ọ bụ naanị na ọ chụrụ ọtụtụ aja dị iche iche, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼebe dị elu dị iche iche.

4Eze gara Gibiọn nʼihi ịchụ aja, nʼihi na ebe ahụ bụ ebe kachasị mkpa, dị elu. Solomọn chụrụ otu puku aja nsure ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.