1 Ndị Eze 4

Nʼihi na ọ chịrị alaeze niile a ruo nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke osimiri Yufretis, site na Tifsa ruo na Gaza. O nwekwara udo nʼakụkụ niile.

1 Kings 4:24 (UKJV) For he had dominion over all the region on this side the river, from Tiphsah even to Azzah, over all the kings on this side the river: and he had peace on all sides round about him.

22Ihe oriri a na-ewebata nʼụlọ Solomọn ụbọchị niile bụ otu narị bushel ụtụ ọka na iri bushel asatọ, na iri akpa ọka a kwọrọ akwọ isii,

23na ehi iri mara abụba, na iri ehi abụọ a zụrụ nʼebe a na-azụ anụ, na narị atụrụ na ewu. A gụnyeghị anụ ele na mgbada na oke ele na ọkụkọ ọma a na-ewebata.

24Nʼihi na ọ chịrị alaeze niile a ruo nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke osimiri Yufretis, site na Tifsa ruo na Gaza. O nwekwara udo nʼakụkụ niile.

25Nʼoge ndụ Solomọn niile, Juda na Izrel site na Dan ruo Bịasheba bi nʼudo. Nwoke ọbụla nọ nʼokpuru osisi vaịnị na nʼokpuru osisi fiig nke ya.

26Ọnụọgụgụ ụlọ a na-etinye ụgbọ agha ịnyịnya na-adọkpụ nke Solomọn nwere dị puku anọ. Ọnụọgụgụ ịnyịnya a na-agba agba o nwere dị puku iri na abụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.