20Nʼoge a, ndị Juda na Izrel bara ụba nʼọnụọgụgụ dịka aja dị nʼakụkụ osimiri. Ha dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ. Ha na-eri na-aṅụ, na-emekwa onwe ha obi ụtọ.
21Ala niile Solomọn na-achị sitere nʼoke osimiri Yufretis ruo ala ndị Filistia, rukwaa nʼoke ala ndị Ijipt. Ndị niile a lụgburu nʼagha nʼobodo ndị a na-atụta ụtụ ha na-enye Solomọn. Ha nọgidekwara nʼokpuru Solomọn ụbọchị niile nke ndụ ya.
22Ihe oriri a na-ewebata nʼụlọ Solomọn ụbọchị niile bụ otu narị bushel ụtụ ọka na iri bushel asatọ, na iri akpa ọka a kwọrọ akwọ isii,
23na ehi iri mara abụba, na iri ehi abụọ a zụrụ nʼebe a na-azụ anụ, na narị atụrụ na ewu. A gụnyeghị anụ ele na mgbada na oke ele na ọkụkọ ọma a na-ewebata.
24Nʼihi na ọ chịrị alaeze niile a ruo nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke osimiri Yufretis, site na Tifsa ruo na Gaza. O nwekwara udo nʼakụkụ niile.