1 Ndị Eze 4

Elihoref na Ahija, ụmụ ndị ikom Shisha, bụ ndị ode akwụkwọ. Jehoshafat, nwa Ahilud bụ onye na-edekọ akụkọ.

1 Kings 4:3 (UKJV) Elihoreph and Ahiah, the sons of Shisha, scribes; Jehoshaphat the son of Ahilud, the recorder.

1Ya mere Solomọn ghọrọ eze ndị Izrel niile.

2Ndị a bụ aha ndịisi ọchịchị obodo eze Solomọn họpụtara inyere ya aka. Azaraya, nwa Zadọk bụ onye nchụaja.

3Elihoref na Ahija, ụmụ ndị ikom Shisha, bụ ndị ode akwụkwọ. Jehoshafat, nwa Ahilud bụ onye na-edekọ akụkọ.

4Benaya, nwa Jehoiada bụ onyeisi agha ndị Izrel. Zadọk na Abịata, bụ ndị nchụaja.

5Azaraya nwa Netan bụ onyeisi na-elekọta ndị na-ejere eze ozi. Zabud nwa Netan bụ onye nchụaja na onye ndụmọdụ nye eze.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.