3Elihoref na Ahija, ụmụ ndị ikom Shisha, bụ ndị ode akwụkwọ. Jehoshafat, nwa Ahilud bụ onye na-edekọ akụkọ.
4Benaya, nwa Jehoiada bụ onyeisi agha ndị Izrel. Zadọk na Abịata, bụ ndị nchụaja.
5Azaraya nwa Netan bụ onyeisi na-elekọta ndị na-ejere eze ozi. Zabud nwa Netan bụ onye nchụaja na onye ndụmọdụ nye eze.
6Ahisha, bụ onyeisi na-elekọta nʼụlọeze. Adoniram nwa Abda bụ onyeisi na-elekọta ndị ọrụ mmanye.
7Eze Solomọn họpụtara ndị ikom iri na abụọ ndị o mere ndịisi ga-elekọta akụkụ iri na abụọ nke o mere ka Izrel dịrị. Mmadụ iri na abụọ ndị a nwekwa ọrụ iwetara eze ihe oriri. Nwoke ọbụla nʼime ha nwe iwetara eze na ezinaụlọ ya ihe oriri otu ọnwa nʼafọ.