1 Ndị Eze 6

O wuru ọtụtụ ọnụụlọ nta nʼakụkụ mgbidi gbara ụlọnsọ ukwu ahụ gburugburu. Ọ bụkwa osisi sida ka e ji jikọta mgbidi ụlọ ahụ na ọnụụlọ nta ndị ahụ. Ịdị elu nke ọbụla nʼime ha bụ mita abụọ na ọkara.

1 Kings 6:10 (UKJV) And then he built chambers against all the house, five cubits high: and they rested on the house with timber of cedar.

8Ọnụ ụzọ e si abata nʼọnụ ụlọ ndị dị nʼokpukpu ụlọ elu nke mbụ dị nʼakụkụ aka nri nke ụlọnsọ ukwu ahụ. E nwekwara ụzọ nrigo e wuru e si abanye nʼọnụ ụlọ ndị dị nʼokpukpu ndị dị nʼetiti. A na-esitekwa na nke a rigoro ruo na nke atọ.

9Mgbe o wusiri ụlọnsọ ukwu a, Solomọn jiri ibe osisi na osisi dị obosara e si nʼosisi sida mepụta, wuo ihe mgbachị elu ụlọ ahụ.

10O wuru ọtụtụ ọnụụlọ nta nʼakụkụ mgbidi gbara ụlọnsọ ukwu ahụ gburugburu. Ọ bụkwa osisi sida ka e ji jikọta mgbidi ụlọ ahụ na ọnụụlọ nta ndị ahụ. Ịdị elu nke ọbụla nʼime ha bụ mita abụọ na ọkara.

11Okwu Onyenwe anyị rutere Solomọn ntị,

12“Banyere ụlọnsọ ukwu a i na-ewu, ọ bụrụ na i mee ihe m gwara gị, gbasoo ihe niile m nyere gị nʼiwu, ma mezuo okwu m niile, aga m esite na gị mezuo nkwa ahụ m kwere nna gị Devid.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.