6Obosara okpukpu ụlọ nke dịkarịsịrị ala bụ mita abụọ na ọkara, obosara okpukpu nke ụlọ etiti dị mita atọ, otu a kwa, obosara okpukpu ụlọ nke atọ dị mita atọ na ọkara. Mgbe e wuru mgbidi gbara ụlọnsọ ukwu ahụ gburugburu, e wukwara ihe dịka aka nʼakụkụ mgbidi ahụ niile. Ọ bụ nʼelu ihe ndị a dịka aka ka e dokwasịrị osisi e ji wuo ọnụụlọ nta ndị ahụ. Nʼụzọ dị otu a, ka e ji gbochie ịmanye ihe ọbụla nʼaja ụlọnsọ ukwu ahụ.
7Mgbe a na-ewu ụlọnsọ ukwu ahụ, ọ bụ naanị nkume awara nke ọma nʼebe a nọ gwupụta ha ka eji wuo ya. O nweghị onye nụrụ ụzụ itipịa nkume, maọbụ ụzụ ịwa osisi, maọbụ ụdị mkpọtụ ahụ ngwa ọrụ mkpirisi igwe na-eme, nʼebe a nọ wuo ụlọnsọ ukwu ahụ, mgbe a na-ewu ya.
8Ọnụ ụzọ e si abata nʼọnụ ụlọ ndị dị nʼokpukpu ụlọ elu nke mbụ dị nʼakụkụ aka nri nke ụlọnsọ ukwu ahụ. E nwekwara ụzọ nrigo e wuru e si abanye nʼọnụ ụlọ ndị dị nʼokpukpu ndị dị nʼetiti. A na-esitekwa na nke a rigoro ruo na nke atọ.
9Mgbe o wusiri ụlọnsọ ukwu a, Solomọn jiri ibe osisi na osisi dị obosara e si nʼosisi sida mepụta, wuo ihe mgbachị elu ụlọ ahụ.
10O wuru ọtụtụ ọnụụlọ nta nʼakụkụ mgbidi gbara ụlọnsọ ukwu ahụ gburugburu. Ọ bụkwa osisi sida ka e ji jikọta mgbidi ụlọ ahụ na ọnụụlọ nta ndị ahụ. Ịdị elu nke ọbụla nʼime ha bụ mita abụọ na ọkara.