13Aga m ebikwa nʼetiti ndị Izrel, agaghị m ahapụkwa ndị m, Izrel.”
14Emesịa, Solomọn wusiri ụlọnsọ ukwu ahụ.
15O ji osisi sida dị obosara machie ahụ ime ụlọnsọ ukwu ahụ site nʼakụkụ ala ruo nʼelu ya. E jikwa osisi junipa machie ala ụlọ ahụ niile.
16O ji osisi sida kewapụta ihe ruru mita itoolu nʼazụ ụlọnsọ ukwu ahụ, site nʼala ụlọ ahụ ruo nʼelu, nʼihi iwepụta site nʼụlọnsọ ahụ, ime ime ebe nsọ, nke bụ Ebe Kachasị Nsọ.
17Ụlọ ezumezu nke dị nʼihu ọnụụlọ a dị iri mita na asatọ.