1 Ndị Eze 6

O ji osisi sida kewapụta ihe ruru mita itoolu nʼazụ ụlọnsọ ukwu ahụ, site nʼala ụlọ ahụ ruo nʼelu, nʼihi iwepụta site nʼụlọnsọ ahụ, ime ime ebe nsọ, nke bụ Ebe Kachasị Nsọ.

1 Kings 6:16 (UKJV) And he built twenty cubits on the sides of the house, both the floor and the walls with boards of cedar: he even built them for it within, even for the oracle, even for the most holy place.

14Emesịa, Solomọn wusiri ụlọnsọ ukwu ahụ.

15O ji osisi sida dị obosara machie ahụ ime ụlọnsọ ukwu ahụ site nʼakụkụ ala ruo nʼelu ya. E jikwa osisi junipa machie ala ụlọ ahụ niile.

16O ji osisi sida kewapụta ihe ruru mita itoolu nʼazụ ụlọnsọ ukwu ahụ, site nʼala ụlọ ahụ ruo nʼelu, nʼihi iwepụta site nʼụlọnsọ ahụ, ime ime ebe nsọ, nke bụ Ebe Kachasị Nsọ.

17Ụlọ ezumezu nke dị nʼihu ọnụụlọ a dị iri mita na asatọ.

18Ahụ ime ụlọnsọ ukwu ahụ bụ osisi sida, nke a tụrụ ihe ọtụtụ nke oyiyi afụfa ọhịa na okoko osisi wasara awasa nʼelu ya. Ihe niile dị nʼime ụlọ ahụ bụ osisi sida, adịghị ahụ nkume ọbụla anya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.