1 Ndị Eze 6

Solomọn ji ọlaedo a nụchara anụcha machie ahụ ime ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ gbatịrị ụdọ ọlaedo gafere nʼihu ime ime ebe nsọ ahụ, nke e jikwa ọlaedo machie.

1 Kings 6:21 (UKJV) So Solomon overlaid the house within with pure gold: and he made a partition by the chains of gold before the oracle; and he overlaid it with gold.

19Ọ kwadokwara ebe nsọ ahụ, ebe dị nʼime ime ụlọ ahụ, maka idebe igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị nʼebe ahụ.

20Ime ime ebe nsọ ahụ, dị mita iri nʼogologo, obosara ya dịkwa mita iri, ịdị elu ya dịkwa mita iri. O ji ọlaedo a nụchara anụcha machie ahụ ime ụlọ a niile, jiri osisi sida machie ebe nchụaja ya.

21Solomọn ji ọlaedo a nụchara anụcha machie ahụ ime ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ gbatịrị ụdọ ọlaedo gafere nʼihu ime ime ebe nsọ ahụ, nke e jikwa ọlaedo machie.

22Ya mere, o ji ọlaedo machie ime ya niile. O jikwa ọlaedo machie ebe ịchụ aja nke dịịrị ime ime ebe nsọ ahụ.

23O mere cherubim abụọ, nke e ji osisi oliv tụọ nʼime ime ebe nsọ ahụ, ịdị elu nke ọbụla bụ mita ise.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.