22Ya mere, o ji ọlaedo machie ime ya niile. O jikwa ọlaedo machie ebe ịchụ aja nke dịịrị ime ime ebe nsọ ahụ.
23O mere cherubim abụọ, nke e ji osisi oliv tụọ nʼime ime ebe nsọ ahụ, ịdị elu nke ọbụla bụ mita ise.
24Cherub nke mbụ nwere nku abụọ, otu nku dị mita abụọ na ụma atọ nʼogologo, nku nke ọzọ dịkwa mita abụọ na ụma atọ nʼogologo. Ya bụ, mita ise site na ụma isii, site nʼọnụ otu nku ruo nʼọnụ nku nke ọzọ.
25Cherub nke abụọ dịkwa iri mita na ụma isii, nʼihi na cherubim abụọ ndị a bụ otu nʼọtụtụ nakwa nʼibu ibu.
26Ịdị elu nke cherub ọbụla ruru mita ise na ụma isii.