1 Ndị Eze 6

Cherub nke abụọ dịkwa iri mita na ụma isii, nʼihi na cherubim abụọ ndị a bụ otu nʼọtụtụ nakwa nʼibu ibu.

1 Kings 6:25 (UKJV) And the other cherub was ten cubits: both the cherubims were of one measure and one size.

23O mere cherubim abụọ, nke e ji osisi oliv tụọ nʼime ime ebe nsọ ahụ, ịdị elu nke ọbụla bụ mita ise.

24Cherub nke mbụ nwere nku abụọ, otu nku dị mita abụọ na ụma atọ nʼogologo, nku nke ọzọ dịkwa mita abụọ na ụma atọ nʼogologo. Ya bụ, mita ise site na ụma isii, site nʼọnụ otu nku ruo nʼọnụ nku nke ọzọ.

25Cherub nke abụọ dịkwa iri mita na ụma isii, nʼihi na cherubim abụọ ndị a bụ otu nʼọtụtụ nakwa nʼibu ibu.

26Ịdị elu nke cherub ọbụla ruru mita ise na ụma isii.

27O tinyere cherubim ndị a nke gbasapụrụ nku ha nʼime ime Ebe Nsọ Kachasị Nsọ nke ụlọnsọ ukwu. Ọnụ ọnụ nke nku cherub ọbụla na-emetụ otu akụkụ ahụ ụlọ ahụ, ebe ọnụ ọnụ nke nku cherub ọbụla na-emetụ na nke ibe ya nʼetiti ọnụụlọ ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.