1 Ndị Eze 8

Biko, site nʼeluigwe nụrụ ma gbagharakwa mmehie ndị ohu gị, bụ ndị gị Izrel. Kuziere ha ezi ụzọ ha ga-esi bie ndụ ma zidata mmiri ozuzo nʼala ahụ nke i nyere ndị gị ka ọ bụrụ ihe nketa ha.

1 Kings 8:36 (UKJV) Then hear you in heaven, and forgive the sin of your servants, and of your people Israel, that you teach them the good way wherein they should walk, and give rain upon your land, which you have given to your people for an inheritance.

34biko, site nʼeluigwe nụrụ ekpere ha, gbaghara mmehie ndị gị Izrel. Meekwa ka ha lọghachita nʼala ahụ nke i nyere nna nna ha.

35“Mgbe e gbochiri eluigwe, mee na mmiri adịghị ezokwa, nʼihi na ndị gị emehiela megide gị, ọ bụrụ na ha echee ihu nʼebe a kpee ekpere, too aha gị, si na mmehie ha chegharịa, nʼihi na ịtaala ha ahụhụ.

36Biko, site nʼeluigwe nụrụ ma gbagharakwa mmehie ndị ohu gị, bụ ndị gị Izrel. Kuziere ha ezi ụzọ ha ga-esi bie ndụ ma zidata mmiri ozuzo nʼala ahụ nke i nyere ndị gị ka ọ bụrụ ihe nketa ha.

37“Mgbe ụnwụ maọbụ ajọ ọrịa na-efe efe ga-adakwasị ala a, maọbụ ọrịa na-eripịa ihe ubi maọbụ ọmụma ebu, maọbụ igurube maọbụ ụkpana, maọbụ mgbe onye iro nọchibidoro ha nʼobodo ha niile, ihe mbibi niile maọbụ ọrịa ọbụla,

38ekpere ọbụla maọbụ arịrịọ nke onye ọbụla nʼetiti ndị gị Izrel kpere ma rịọọ, nʼihi ịghọta ihe otiti niile nke obi ha, ha gbasapụ aka ha, ma chee ihu ha nʼebe ụlọnsọ ukwu dị,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.