1 Ndị Eze 8

ekpere ọbụla maọbụ arịrịọ nke onye ọbụla nʼetiti ndị gị Izrel kpere ma rịọọ, nʼihi ịghọta ihe otiti niile nke obi ha, ha gbasapụ aka ha, ma chee ihu ha nʼebe ụlọnsọ ukwu dị,

1 Kings 8:38 (UKJV) What prayer and supplication whatsoever be made by any man, or by all your people Israel, which shall know every man the plague of his own heart, and spread forth his hands toward this house:

36Biko, site nʼeluigwe nụrụ ma gbagharakwa mmehie ndị ohu gị, bụ ndị gị Izrel. Kuziere ha ezi ụzọ ha ga-esi bie ndụ ma zidata mmiri ozuzo nʼala ahụ nke i nyere ndị gị ka ọ bụrụ ihe nketa ha.

37“Mgbe ụnwụ maọbụ ajọ ọrịa na-efe efe ga-adakwasị ala a, maọbụ ọrịa na-eripịa ihe ubi maọbụ ọmụma ebu, maọbụ igurube maọbụ ụkpana, maọbụ mgbe onye iro nọchibidoro ha nʼobodo ha niile, ihe mbibi niile maọbụ ọrịa ọbụla,

38ekpere ọbụla maọbụ arịrịọ nke onye ọbụla nʼetiti ndị gị Izrel kpere ma rịọọ, nʼihi ịghọta ihe otiti niile nke obi ha, ha gbasapụ aka ha, ma chee ihu ha nʼebe ụlọnsọ ukwu dị,

39mgbe ahụ, site nʼeluigwe bụ ebe obibi gị nụrụ arịrịọ ha. Gbaghara ma meekwa; mesoo onye ọbụla dịka ihe niile ha na-eme si dị, ebe ọ bụ na ị maara obi ha niile, nʼihi na naanị gị maara obi mmadụ ọbụla,

40ka ha tụọ egwu gị oge niile nke ha na-ebi nʼala ahụ nke i nyere nna nna anyị ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.