1 Ndị Eze 8

mgbe ahụ, site nʼeluigwe bụ ebe obibi gị nụrụ arịrịọ ha. Gbaghara ma meekwa; mesoo onye ọbụla dịka ihe niile ha na-eme si dị, ebe ọ bụ na ị maara obi ha niile, nʼihi na naanị gị maara obi mmadụ ọbụla,

1 Kings 8:39 (UKJV) Then hear you in heaven your dwelling place, and forgive, and do, and give to every man according to his ways, whose heart you know; (for you, even you only, know the hearts of all the children of men;)

37“Mgbe ụnwụ maọbụ ajọ ọrịa na-efe efe ga-adakwasị ala a, maọbụ ọrịa na-eripịa ihe ubi maọbụ ọmụma ebu, maọbụ igurube maọbụ ụkpana, maọbụ mgbe onye iro nọchibidoro ha nʼobodo ha niile, ihe mbibi niile maọbụ ọrịa ọbụla,

38ekpere ọbụla maọbụ arịrịọ nke onye ọbụla nʼetiti ndị gị Izrel kpere ma rịọọ, nʼihi ịghọta ihe otiti niile nke obi ha, ha gbasapụ aka ha, ma chee ihu ha nʼebe ụlọnsọ ukwu dị,

39mgbe ahụ, site nʼeluigwe bụ ebe obibi gị nụrụ arịrịọ ha. Gbaghara ma meekwa; mesoo onye ọbụla dịka ihe niile ha na-eme si dị, ebe ọ bụ na ị maara obi ha niile, nʼihi na naanị gị maara obi mmadụ ọbụla,

40ka ha tụọ egwu gị oge niile nke ha na-ebi nʼala ahụ nke i nyere nna nna anyị ha.

41“Ma banyere onye mba ọzọ, onye na-esonyeghị na ndị gị Izrel, kama o si nʼala ebe dị anya bịa nʼihi Aha gị,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.