11Eze Solomọn nyere Hiram, eze Taịa, iri obodo abụọ dị na Galili, nʼihi osisi sida, na osisi junipa, na ọlaedo niile Hiram butere ya dịka o si chọọ ya.
12Ma mgbe Hiram si Taịa gaa ịhụ obodo ndị a nke Solomọn nyere ya, ha amasịghị obi ya.
13Ya mere, ọ jụrụ sị, “Nwanne m nwoke, ụdị obodo dị aṅaa bụ ihe a i nyere m?” Nʼihi ya, ọ kpọrọ ha Kabul, aha ọ na-aza ruo taa.
14Hiram zigaara eze ọlaedo dị puku kilogram anọ na iri asatọ.
15Nke a bụ akụkọ banyere ndị ọrụ mmanye niile eze bụ Solomọn chịkọtara maka ịrụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ụlọeze nke ya, na ebe e wusiri ike nke Milo, na mgbidi Jerusalem, Hazọ, Megido nakwa Gaza.