1 Ndị Eze 9

Ugboro atọ nʼafọ, ka Solomọn na-achụ aja nsure ọkụ, na aja udo nʼelu ebe ịchụ aja o wuru nye Onyenwe anyị, tinyere aja nsure ọkụ ihe na-esi isi ụtọ ọ na-achụ nʼihu Onyenwe anyị. O si otu a wuchaa ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

1 Kings 9:25 (UKJV) And three times in a year did Solomon offer burnt offerings and peace offerings upon the altar which he built unto the LORD, and he burnt incense upon the altar that was before the LORD. So he finished the house.

23Ndị a bụkwa ndịisi na-ahụ ihe banyere ọrụ niile nke Solomọn ji nʼaka. Ndị Izrel dị narị ise na iri ise (550), ka e mere ndịisi na-elekọta ndị ọrụ Solomọn.

24Emesịa, ada Fero sitere nʼobodo Devid pụta gbagoo nʼụlọeze nke Solomọn wuuru ya. Solomọn wukwara ebe mpụta nke ụlọ ahụ.

25Ugboro atọ nʼafọ, ka Solomọn na-achụ aja nsure ọkụ, na aja udo nʼelu ebe ịchụ aja o wuru nye Onyenwe anyị, tinyere aja nsure ọkụ ihe na-esi isi ụtọ ọ na-achụ nʼihu Onyenwe anyị. O si otu a wuchaa ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

26Eze Solomọn wukwara ọtụtụ ụgbọ mmiri nʼEziọn Geba, bụ nke dị nʼakụkụ Elat, nʼọnụ mmiri Oke osimiri Uhie nʼala Edọm.

27Hiram zigaara ndị ikom ya na-anya ụgbọ, ndị maara ihe banyere ime njem osimiri nke ọma, ka ha soro ndị ikom Solomọn jee ozi nʼime ụgbọ ndị a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.