15Kama bụrụnụ ndị dị nsọ nʼihe niile unu na-eme, dịka onye kpọrọ unu si dị nsọ.
16Nʼihi na e dere ya ede, “Dịnụ nsọ, nʼihi na adị m nsọ.”
17Ebe unu na-akpọku Nna ahụ na-ekpe onye ọbụla ikpe dị ka ọrụ ya sịrị dị na-eleghị mmadụ anya nʼihu, bienụ ndụ unu nʼịtụ egwu Chineke, dịka ndị mbịarambịa nʼụwa a.
18Nʼihi na unu matara na-ejighị ihe pụrụ imebi emebi, dịka ọlaọcha na ọlaedo gbapụta unu site nʼibi ndụ ọjọọ ahụ nna nna unu ha nyefere unu nʼaka
19kama ọ bụ ọbara dị oke ọnụahịa nke Kraịst bụ nwa atụrụ na-enweghị ntụpọ ọbụla maọbụ ọrụsị.