19Nʼihi na nke a bụ ihe inye ekele ma ọ bụrụ na unu ejiri ntachiobi na-edi ahụhụ na-ezighị ezi na-adakwasị unu, nʼihi na unu na-eme ihe Chineke na-achọ.
20Ma o nweghị otuto ọbụla dịrị unu mgbe a tara unu ahụhụ nʼihi na unu mejọrọ, unu na-edikwa ya? Ma ọ bụrụ na unu enwee ntachiobi mgbe a na-ata unu ahụhụ nʼihi ihe ọma unu na-eme, nke a na-ewetara Chineke otuto.
21Ọ bụ nʼihi ihe dị otu a, ka e jiri kpọọ unu, nʼihi na Kraịst hụrụ ahụhụ nʼihi unu. Ọ bụkwa ihe ịmaatụ nye unu. Na-esonụ nzọ ụkwụ ya.
22“O nweghị mgbe ọbụla o mehiere, o nwekwaghị mgbe onye ọbụla nụrụ okwu aghụghọ nʼọnụ ya.”
23O kwutọghị onye ọbụla mgbe ha na-ekwutọ ya. Ọ baghị mba ọbụla mgbe ha na-ata ya ahụhụ, kama o were ya nyefee nʼaka onye ahụ na-ekpe ikpe ziri ezi.