1 Pita 2

Ma o nweghị otuto ọbụla dịrị unu mgbe a tara unu ahụhụ nʼihi na unu mejọrọ, unu na-edikwa ya? Ma ọ bụrụ na unu enwee ntachiobi mgbe a na-ata unu ahụhụ nʼihi ihe ọma unu na-eme, nke a na-ewetara Chineke otuto.

1 Peter 2:20 (UKJV) For what glory is it, if, when all of you be buffeted for your faults, all of you shall take it patiently? but if, when all of you do well, and suffer for it, all of you take it patiently, this is acceptable with God.

18Ndị ohu, ruberenụ ndị nwe unu isi, na-enyekwa ha nsọpụrụ na ugwu ruuru ha. Unu emela nke a nye naanị ndị bụ ezi mmadụ, na ndị nwere obiọma nʼebe unu nọ, kama meekwanụ ya ọ bụladị nye ndị afọ tara mmiri.

19Nʼihi na nke a bụ ihe inye ekele ma ọ bụrụ na unu ejiri ntachiobi na-edi ahụhụ na-ezighị ezi na-adakwasị unu, nʼihi na unu na-eme ihe Chineke na-achọ.

20Ma o nweghị otuto ọbụla dịrị unu mgbe a tara unu ahụhụ nʼihi na unu mejọrọ, unu na-edikwa ya? Ma ọ bụrụ na unu enwee ntachiobi mgbe a na-ata unu ahụhụ nʼihi ihe ọma unu na-eme, nke a na-ewetara Chineke otuto.

21Ọ bụ nʼihi ihe dị otu a, ka e jiri kpọọ unu, nʼihi na Kraịst hụrụ ahụhụ nʼihi unu. Ọ bụkwa ihe ịmaatụ nye unu. Na-esonụ nzọ ụkwụ ya.

22“O nweghị mgbe ọbụla o mehiere, o nwekwaghị mgbe onye ọbụla nụrụ okwu aghụghọ nʼọnụ ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.