20Ma o nweghị otuto ọbụla dịrị unu mgbe a tara unu ahụhụ nʼihi na unu mejọrọ, unu na-edikwa ya? Ma ọ bụrụ na unu enwee ntachiobi mgbe a na-ata unu ahụhụ nʼihi ihe ọma unu na-eme, nke a na-ewetara Chineke otuto.
21Ọ bụ nʼihi ihe dị otu a, ka e jiri kpọọ unu, nʼihi na Kraịst hụrụ ahụhụ nʼihi unu. Ọ bụkwa ihe ịmaatụ nye unu. Na-esonụ nzọ ụkwụ ya.
22“O nweghị mgbe ọbụla o mehiere, o nwekwaghị mgbe onye ọbụla nụrụ okwu aghụghọ nʼọnụ ya.”
23O kwutọghị onye ọbụla mgbe ha na-ekwutọ ya. Ọ baghị mba ọbụla mgbe ha na-ata ya ahụhụ, kama o were ya nyefee nʼaka onye ahụ na-ekpe ikpe ziri ezi.
24Nʼelu obe ahụ, o buuru mmehie anyị niile bokwasị onwe ya mgbe ọ nwụrụ, ime ka anyị nwee ike ịbụ ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị; ma dịrị ndụ nʼebe ezi omume dị. Ọ bụkwa site nʼapa ọnya dị ya nʼahụ ka o ji gwọọ unu.