1 Samuel 1

Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Onyenwe m, dịka ị si na-adị ndụ, ọ bụ m bụ nwanyị ahụ guzoro onwe ya nso nʼebe ị nọ kpee ekpere nye Onyenwe anyị.

1 Samuel 1:26 (UKJV) And she said, Oh my lord, as your soul lives, my lord, I am the woman that stood by you here, praying unto the LORD.

24Mgbe ọ kwụsịrị nwantakịrị ahụ ịṅụ ara, nwantakịrị ahụ ka dị ntakịrị. Ma o duuru ya, jiri oke ehi gbara afọ atọ, na iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu karama mmanya, gaa nʼụlọ Onyenwe anyị dị na Shaịlo.

25Mgbe ha ji oke ehi ahụ chụsịa aja, ha kpọtaara Elayị nwantakịrị ahụ.

26Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Onyenwe m, dịka ị si na-adị ndụ, ọ bụ m bụ nwanyị ahụ guzoro onwe ya nso nʼebe ị nọ kpee ekpere nye Onyenwe anyị.

27Nʼihi nwa a ka m kpere ekpere, Onyenwe anyị emelara m ihe m rịọrọ nʼaka ya.

28Ma ugbu a, ana m enyeghachi ya Onyenwe anyị ka ọ bụrụ nke ya ndụ ya niile.” O fere Onyenwe anyị ofufe nʼebe ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.