12Otu nʼime ndị bi nʼebe ahụ jụrụ sị, “Onye ka nna ha bụ?” Nke a bụ mmalite okwu ahụ a na-ekwu sị, “Sọl ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?”
13Mgbe Sọl buchara amụma, ọ rigooro gaa nʼebe ịchụ aja ahụ dị nʼelu ugwu.
14Mgbe nwanne nna ya hụrụ Sọl, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Olee ebe ị gara?” Sọl zara ya sị, “Anyị gara ịchọ ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu, ma anyị achọtaghị ha, nʼihi ya anyị gara nʼebe onye amụma a na-akpọ Samuel ịjụta ase ebe ha nọ.”
15Ma nwanne nna Sọl sịrị, “Gwa m ihe Samuel gwara gị.”
16Sọl zara ya sị, “Ọ gwara anyị na a chọtala ịnyịnya ibu ndị ahụ.” Ma okwu gbasara alaeze, dịka Samuel siri kwuo ya, ọ gwaghị ya ihe ọbụla.