5“Emesịa, ị ga-aga Gibea nke Chineke, ebe ndị agha ndị Filistia mara ụlọ ikwu nche. Mgbe ị na-abata obodo ahụ, ị ga-ezute ndị amụma, ndị si nʼebe dị elu ahụ na-arịdata. Ha ga na-akpọ une, na egwu otiti, na ọja, na ụbọ akwara. Ha ga na-ebukwa amụma.
6Nʼoge ahụ, mmụọ Onyenwe anyị ga-abịakwasị gị, ị ga-esorokwa ha buo amụma. Ị ga-abụkwa onye a gbanwere, onye dị iche.
7Mgbe ihe ịrịbama ndị a mezuru ị ga na-eme ihe ọbụla i chepụtara nʼobi gị, nʼihi na Chineke nọnyeere gị.
8“Ị ga-aga Gilgal chere m nʼebe ahụ abalị asaa, nʼihi na ana m abịa ịchụ aja nsure ọkụ na aja udo. Aga m agwa gị ihe ị ga-eme mgbe m bịara.”
9Mgbe ọ na-atụgharị ka ọ si ebe Samuel nọ pụọ, Chineke gbanwere ya, nye ya obi ọhụrụ, ihe ịrịbama ndị ahụ mezukwara nʼụbọchị ahụ.