7Mgbe ihe ịrịbama ndị a mezuru ị ga na-eme ihe ọbụla i chepụtara nʼobi gị, nʼihi na Chineke nọnyeere gị.
8“Ị ga-aga Gilgal chere m nʼebe ahụ abalị asaa, nʼihi na ana m abịa ịchụ aja nsure ọkụ na aja udo. Aga m agwa gị ihe ị ga-eme mgbe m bịara.”
9Mgbe ọ na-atụgharị ka ọ si ebe Samuel nọ pụọ, Chineke gbanwere ya, nye ya obi ọhụrụ, ihe ịrịbama ndị ahụ mezukwara nʼụbọchị ahụ.
10Mgbe ya na onye na-ejere ya ozi rutere Gibea, ndị amụma nọ nʼahịrị zutere ha. Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya nʼebe ọ dị ukwu, o sooro ha malite ibu amụma.
11Mgbe ndị niile maara Sọl hụrụ ya ka o so ndị a na-ebu amụma, ha jụrụ onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị mere nwa Kish? Sọl, ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?”