9Mgbe ọ na-atụgharị ka ọ si ebe Samuel nọ pụọ, Chineke gbanwere ya, nye ya obi ọhụrụ, ihe ịrịbama ndị ahụ mezukwara nʼụbọchị ahụ.
10Mgbe ya na onye na-ejere ya ozi rutere Gibea, ndị amụma nọ nʼahịrị zutere ha. Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya nʼebe ọ dị ukwu, o sooro ha malite ibu amụma.
11Mgbe ndị niile maara Sọl hụrụ ya ka o so ndị a na-ebu amụma, ha jụrụ onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị mere nwa Kish? Sọl, ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?”
12Otu nʼime ndị bi nʼebe ahụ jụrụ sị, “Onye ka nna ha bụ?” Nke a bụ mmalite okwu ahụ a na-ekwu sị, “Sọl ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?”
13Mgbe Sọl buchara amụma, ọ rigooro gaa nʼebe ịchụ aja ahụ dị nʼelu ugwu.