3“Mgbe i ruru nʼosisi ukwu Taboa, ị ga-ezute ndị ikom atọ ndị na-aga ife Chineke ofufe na Betel. Otu nʼime ha ga-ebu ụmụ ewu atọ, nke ọzọ ga-eji ogbe achịcha atọ, ma nke atọ ga-eji otu karama mmanya.
4Ha ga-ajụ gị banyere ọdịmma gị, nyekwa gị ogbe achịcha abụọ, nke ị ga-anara site nʼaka ha.
5“Emesịa, ị ga-aga Gibea nke Chineke, ebe ndị agha ndị Filistia mara ụlọ ikwu nche. Mgbe ị na-abata obodo ahụ, ị ga-ezute ndị amụma, ndị si nʼebe dị elu ahụ na-arịdata. Ha ga na-akpọ une, na egwu otiti, na ọja, na ụbọ akwara. Ha ga na-ebukwa amụma.
6Nʼoge ahụ, mmụọ Onyenwe anyị ga-abịakwasị gị, ị ga-esorokwa ha buo amụma. Ị ga-abụkwa onye a gbanwere, onye dị iche.
7Mgbe ihe ịrịbama ndị a mezuru ị ga na-eme ihe ọbụla i chepụtara nʼobi gị, nʼihi na Chineke nọnyeere gị.