1 Samuel 12

Ugbu a, leenụ eze unu họpụtara, nʼihi na ọ bụ unu rịọrọ Onyenwe anyị ka o nye unu ya; Onyenwe anyị azakwala arịrịọ unu.

1 Samuel 12:13 (UKJV) Now therefore behold the king whom all of you have chosen, and whom all of you have desired! and, behold, the LORD has set a king over you.

11Onyenwe anyị zitere Jerub-Baal, na Barak, na Jefta, na Samuel, ka ha zọpụta unu site nʼaka ndị iro nọ unu gburugburu, mee ka unu biri nʼudo.

12“Ma mgbe unu hụrụ na Nahash, eze ndị Amọn na-achọ ibuso unu agha, unu tụrụ egwu bịakwute m sị m, ‘Mba, anyị chọrọ eze ga-achị anyị,’ nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị Chineke unu bụ eze unu.

13Ugbu a, leenụ eze unu họpụtara, nʼihi na ọ bụ unu rịọrọ Onyenwe anyị ka o nye unu ya; Onyenwe anyị azakwala arịrịọ unu.

14Ugbu a, ọ bụrụ na unu ga-atụ egwu Onyenwe anyị, fee ya, rubere ya isi, hapụ inupu isi nʼebe iwu ya dị, ọ bụrụkwa na unu na eze unu ga-esogide Onyenwe anyị Chineke unu, ihe niile ga-adị mma.

15Ma ọ bụrụ na unu enupu isi nʼiwu Onyenwe anyị, jụ ige ya ntị, aka ya ga-abịakwasị unu nʼoke iwe, ọ ga-emekwa unu ihe o mere nna nna unu ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.