1 Samuel 12

Samuel zara sị, “Unu atụla egwu. Unu emeela ihe ọjọọ ndị a niile, ma hụkwanụ na unu ji obi unu niile fee Onyenwe anyị ofufe. Unu agbakụtakwala ya azụ nʼụzọ ọbụla.

1 Samuel 12:20 (UKJV) And Samuel said unto the people, Fear not: all of you have done all this wickedness: yet turn not aside from following the LORD, but serve the LORD with all your heart;

18Mgbe ahụ Samuel kpọkuru Onyenwe anyị, Onyenwe anyị zidatakwara egbe eluigwe na mmiri ozuzo nʼụbọchị ahụ. Nke a mere ka mmadụ niile tụọ Onyenwe anyị na Samuel egwu.

19Ndị ahụ rịọrọ Samuel arịrịọ sị ya, “Biko kpeere anyị ekpere nye Onyenwe anyị Chineke gị ka anyị bụ ndị ohu gị ghara ịnwụ. Nʼihi na, nʼezie, anyị ejirila aka anyị mee ka mmehie anyị mụbaa site nʼịrịọ ka e nye anyị eze.”

20Samuel zara sị, “Unu atụla egwu. Unu emeela ihe ọjọọ ndị a niile, ma hụkwanụ na unu ji obi unu niile fee Onyenwe anyị ofufe. Unu agbakụtakwala ya azụ nʼụzọ ọbụla.

21Unu agbasola chi ndị ọzọ, nʼihi na ha abaghị uru. Ha agaghị enyere unu aka maọbụ napụta unu site nʼaka ndị iro unu.

22Onyenwe anyị agaghị ahapụ ndị ya ọ họpụtara, nʼihi na-ime ihe dị otu a bụ iwetara aha ya dị ukwuu ihere. Ọ tọrọ Onyenwe anyị ụtọ ime unu mba pụrụ iche nye onwe ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.