21Unu agbasola chi ndị ọzọ, nʼihi na ha abaghị uru. Ha agaghị enyere unu aka maọbụ napụta unu site nʼaka ndị iro unu.
22Onyenwe anyị agaghị ahapụ ndị ya ọ họpụtara, nʼihi na-ime ihe dị otu a bụ iwetara aha ya dị ukwuu ihere. Ọ tọrọ Onyenwe anyị ụtọ ime unu mba pụrụ iche nye onwe ya.
23Ma banyere mụ onwe m, ọ ga-abụrụ m ihe arụ ma a sị na m ga-emehie megide Onyenwe anyị site nʼịkwụsị ikpere unu ekpere. Aga m anọgidekwa na-ezi unu ihe ndị ahụ dị mma, na ihe ndị ahụ kwesiri ekwesi.
24Naanị tụọnụ egwu Onyenwe anyị, werekwanụ obi unu fee ya ofufe nʼikwesị ntụkwasị obi; chetanụ ihe ukwuu niile o meere unu.
25Ma ọ bụrụ na unu anọgide na-eme ihe ọjọọ, unu na eze unu ka a ga-ekpochapụ.”