1 Samuel 13

Ma ugbu a, alaeze gị agaghị adịgide. Onyenwe anyị achọpụtala otu nwoke dịka ọchịchọ obi ya si dị, ọ họpụtakwala ya ịbụ eze nke ndị ya; nʼihi na ị debeghị ihe Onyenwe anyị nyere gị nʼiwu.”

1 Samuel 13:14 (UKJV) But now your kingdom shall not continue: the LORD has sought him a man after his own heart, and the LORD has commanded him to be captain over his people, because you have not kept that which the LORD commanded you.

12echeere m, ‘Ugbu a, ndị Filistia ga-arịdakwute m ibuso m agha na Gilgal, ma arịọbeghị m ihuọma Onyenwe anyị.’ Ya mere m, m jisie ike chụọ aja nsure ọkụ ahụ.”

13Samuel sịrị Sọl, “Ị kpara agwa onye nzuzu. I debeghị ihe Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu idebe. A si na i mere nke a, ọ gaara eme ka alaeze gị guzosie ike nʼebe Izrel nọ ruo mgbe niile.

14Ma ugbu a, alaeze gị agaghị adịgide. Onyenwe anyị achọpụtala otu nwoke dịka ọchịchọ obi ya si dị, ọ họpụtakwala ya ịbụ eze nke ndị ya; nʼihi na ị debeghị ihe Onyenwe anyị nyere gị nʼiwu.”

15Samuel biliri hapụ Gilgal gaa Gibea nʼala Benjamin. Mgbe Sọl gụrụ ndị agha so ya, ọ chọpụtara na ha dị naanị narị isii.

16Sọl na nwa ya nwoke Jonatan, na narị mmadụ isii ndị soo ha nọ na Geba nʼala Benjamin, ebe ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Mikmash.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.