1 Samuel 13

Mgbe ndị agha Izrel hụrụ na ọnọdụ ha dị njọ nke ukwuu, hụkwa na ndị iro na-emegide ha, ha zoro onwe ha nʼọgba nkume, nʼime oke ọhịa, nʼetiti nkume, nʼime olulu na nʼime oghere ọbụla.

1 Samuel 13:6 (UKJV) When the men of Israel saw that they were in a strait, (for the people were distressed,) then the people did hide themselves in caves, and in thickets, and in rocks, and in high places, and in pits.

4Ya mere, ụmụ Izrel niile nụrụ akụkọ ahụ nke kwuru sị, “Sọl ebusola ọmụma ụlọ ikwu ndị agha Filistia agha, nʼihi nke a, ndị Izrel niile abụrụla ndị a kpọrọ asị ugbu a nʼetiti ndị Filistia.” Ya mere, ndị agha Izrel niile pụtakwara soro Sọl gaa Gilgal.

5Ndị Filistia nʼonwe ha chịkọtara ndị agha ha ibuso ndị Izrel agha. Ọnụọgụgụ ụgbọ agha ha dị puku atọ, ndị na-agba ịnyịnya ha nwere dị puku isii; ndị agha ha ndị ọzọ dị ukwu nʼọnụọgụgụ. Nʼezie, ha dị ukwuu dịka aja dị nʼọnụ osimiri. Ha manyere ụlọ ikwu ha na Mikmash nʼọwụwa anyanwụ Bet-Aven.

6Mgbe ndị agha Izrel hụrụ na ọnọdụ ha dị njọ nke ukwuu, hụkwa na ndị iro na-emegide ha, ha zoro onwe ha nʼọgba nkume, nʼime oke ọhịa, nʼetiti nkume, nʼime olulu na nʼime oghere ọbụla.

7Ndị Hibru ụfọdụ gafere Jọdan ruo nʼala Gad na Gilead. Nʼoge a, Sọl nọ na Gilgal, ndị agha niile ya na ha nọ na-amakwa jijiji nʼihi ụjọ.

8Samuel gwararịị Sọl ka o chere ya ruo abalị asaa, ma mgbe abalị asaa zuru Samuel abịaghị Gilgal. Nʼoge a, ndị agha Sọl malitere na-agbasasị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.