1 Samuel 13

Ndị Hibru ụfọdụ gafere Jọdan ruo nʼala Gad na Gilead. Nʼoge a, Sọl nọ na Gilgal, ndị agha niile ya na ha nọ na-amakwa jijiji nʼihi ụjọ.

1 Samuel 13:7 (UKJV) And some of the Hebrews went over Jordan to the land of Gad and Gilead. As for Saul, he was yet in Gilgal, and all the people followed him trembling.

5Ndị Filistia nʼonwe ha chịkọtara ndị agha ha ibuso ndị Izrel agha. Ọnụọgụgụ ụgbọ agha ha dị puku atọ, ndị na-agba ịnyịnya ha nwere dị puku isii; ndị agha ha ndị ọzọ dị ukwu nʼọnụọgụgụ. Nʼezie, ha dị ukwuu dịka aja dị nʼọnụ osimiri. Ha manyere ụlọ ikwu ha na Mikmash nʼọwụwa anyanwụ Bet-Aven.

6Mgbe ndị agha Izrel hụrụ na ọnọdụ ha dị njọ nke ukwuu, hụkwa na ndị iro na-emegide ha, ha zoro onwe ha nʼọgba nkume, nʼime oke ọhịa, nʼetiti nkume, nʼime olulu na nʼime oghere ọbụla.

7Ndị Hibru ụfọdụ gafere Jọdan ruo nʼala Gad na Gilead. Nʼoge a, Sọl nọ na Gilgal, ndị agha niile ya na ha nọ na-amakwa jijiji nʼihi ụjọ.

8Samuel gwararịị Sọl ka o chere ya ruo abalị asaa, ma mgbe abalị asaa zuru Samuel abịaghị Gilgal. Nʼoge a, ndị agha Sọl malitere na-agbasasị.

9Ya mere, Sọl kwuru sị, “Wetaranụ m ihe aja nsure ọkụ na nke aja udo.” Sọl chụkwara aja nsure ọkụ ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.