7Ndị Hibru ụfọdụ gafere Jọdan ruo nʼala Gad na Gilead. Nʼoge a, Sọl nọ na Gilgal, ndị agha niile ya na ha nọ na-amakwa jijiji nʼihi ụjọ.
8Samuel gwararịị Sọl ka o chere ya ruo abalị asaa, ma mgbe abalị asaa zuru Samuel abịaghị Gilgal. Nʼoge a, ndị agha Sọl malitere na-agbasasị.
9Ya mere, Sọl kwuru sị, “Wetaranụ m ihe aja nsure ọkụ na nke aja udo.” Sọl chụkwara aja nsure ọkụ ahụ.
10Ngwangwa ọ na-achụcha aja ndị ahụ, Samuel rutere, Sọl pụrụ izute ya, na ikele ya.
11Samuel sịrị, “Gịnị bụ ihe a i mere?” Sọl zara, “Mgbe m hụrụ na ndị a na-agba aghara aghara, na-esite nʼebe m nọ na-agbapụ, mgbe m lere anya lee, ma ahụghị m ka ị na-abịa dịka i kwuru, mgbe m hụkwara ndị Filistia ka ha nọ na Mikmash, na-akwado ibuso anyị agha,