1 Samuel 14

Otu ụbọchị, Jonatan nwa Sọl, kpọrọ nwokorobịa na-ebu ihe agha ya sị, “Bịa, ka anyị gafee ndagwurugwu jeruo nʼụlọ ikwu ndị Filistia.” Ma ọ gwaghị Sọl nna ya.

1 Samuel 14:1 (UKJV) Now it came to pass on a day, that Jonathan the son of Saul said unto the young man that bare his armour, Come, and let us go over to the Philistines' garrison, that is on the other side. But he told not his father.

1Otu ụbọchị, Jonatan nwa Sọl, kpọrọ nwokorobịa na-ebu ihe agha ya sị, “Bịa, ka anyị gafee ndagwurugwu jeruo nʼụlọ ikwu ndị Filistia.” Ma ọ gwaghị Sọl nna ya.

2Sọl na narị ndị ikom isii ya na-anọdụ nʼebe dị anya site na Gibea, nʼokpuru osisi pomegranet dị na Migrọn.

3Otu nʼime ndị so Sọl bụ Ahija onye nchụaja, onye yi efọọd. Ọ bụ nwa Ahitub, onye bụ nwanne Ịkabọdụ. Ahitub bụ nwa nwa Finehaz, onye bụ nwa Elayị, onye nchụaja Onyenwe anyị na Shaịlo. Ọ dịkwaghị onye ma na Jonatan apụọla.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.