15Oke ọma jijiji dakwasịrị ndị agha niile, na ndị nọ nʼọmụma ụlọ ikwu, ma ndị nọ nʼọhịa, ma ndị nọ nʼebe dịpụrụ adịpụ, ma ndị na-ejegharị ejegharị ibu agha. Ala ahụ niile mara jijiji. Ọ bụ ọma jijiji nke Chineke zitere.
16Ndị nche Sọl, bụ ndị nọ na Gibea nʼime Benjamin, lepụrụ anya hụ igwe ndị agha ka ha malitere ịgba barịị nʼihu na-azụ.
17Mgbe ahụ, Sọl gwara ndị agha ya na ha so, “Gụọnụ ndị agha ọnụ, chọpụta onye na-anọghị nʼebe a.” Mgbe ha mere nke a, ha chọpụtara, na Jonatan na onye na-ebu ihe agha ya anọghị nʼebe ahụ.
18Sọl sịrị Ahija, “Bute igbe ọgbụgba ndụ Chineke.” (Nʼoge ahụ igbe ọgbụgba ndụ dị nʼaka ụmụ Izrel.)
19Mgbe Sọl na-agwa onye nchụaja okwu, ụzụ na iti mkpu nke na-ada nʼụlọ ikwu ndị Filistia dara karịa, nʼihi ya, Sọl gwara onye nchụaja ahụ okwu sị ya, “Sepụ aka gị.”