1 Samuel 14

Site nʼoge Sọl malitere ịchị nʼIzrel, o buru agha megide ndị iro ha nʼakụkụ niile, ndị Moab, ndị Amọn, ndị Edọm, ndị eze Zoba na ndị Filistia. Ebe ọbụla o chere ihu ọ na-alụgbu.

1 Samuel 14:47 (UKJV) So Saul took the kingdom over Israel, and fought against all his enemies on every side, against Moab, and against the children of Ammon, and against Edom, and against the kings of Zobah, and against the Philistines: and anywhere he turned himself, he vexed them.

45Ma ndị ikom ahụ sịrị Sọl, “Jonatan ọ ga-anwụ, bụ onye a wetara nzọpụta a dị ukwuu nʼIzrel? Nke a apụghị ime! Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, ọ bụladị otu agịrị isi agaghị esi nʼisi ya dapụ, nʼihi na Chineke ejirila ya rụọ ọrụ ịtụnanya dị ukwuu taa.” Ya mere, ndị agha ahụ zọpụtara Jonatan, e gbukwaghị ya.

46Emesịa, Sọl kwụsịrị ndị agha ya ịchụ ndị Filistia ọsọ. Ndị Filistia nʼonwe ha lakwara nʼala nke ha.

47Site nʼoge Sọl malitere ịchị nʼIzrel, o buru agha megide ndị iro ha nʼakụkụ niile, ndị Moab, ndị Amọn, ndị Edọm, ndị eze Zoba na ndị Filistia. Ebe ọbụla o chere ihu ọ na-alụgbu.

48O buru agha dị ukwuu, lụgbuo ndị Amalek; ma zọpụta ndị Izrel site nʼaka ndị niile na-emegbu ha site nʼịpụnarị ha ihe ha nwere.

49Sọl mụtara ndị ikom atọ; Jonatan, Ishvi na Malkishua. Ọ mụtakwara ụmụ agbọghọ abụọ, Merab na Mikal.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.