46Emesịa, Sọl kwụsịrị ndị agha ya ịchụ ndị Filistia ọsọ. Ndị Filistia nʼonwe ha lakwara nʼala nke ha.
47Site nʼoge Sọl malitere ịchị nʼIzrel, o buru agha megide ndị iro ha nʼakụkụ niile, ndị Moab, ndị Amọn, ndị Edọm, ndị eze Zoba na ndị Filistia. Ebe ọbụla o chere ihu ọ na-alụgbu.
48O buru agha dị ukwuu, lụgbuo ndị Amalek; ma zọpụta ndị Izrel site nʼaka ndị niile na-emegbu ha site nʼịpụnarị ha ihe ha nwere.
49Sọl mụtara ndị ikom atọ; Jonatan, Ishvi na Malkishua. Ọ mụtakwara ụmụ agbọghọ abụọ, Merab na Mikal.
50Aha nwunye Sọl bụ Ahinoam, ada Ahimaaz. Ọchịagha Sọl bụ Abna, nwa Nea, nwanne nna Sọl.