6Mgbe ha ruru, Samuel hụrụ Eliab kwuo nʼobi ya sị, “Nʼezie, onye nke Onyenwe anyị tere mmanụ na-eguzo nʼihu Onyenwe anyị.”
7Ma Onyenwe anyị zara Samuel sị ya, “Ejila ihu mmadụ maọbụ ito ogologo ya ekpebi, nʼihi na onye a abụghị ya. Onyenwe anyị adịghị ahụ ihe dịka mmadụ si ahụ. Mmadụ na-ele anya nʼelu ahụ, ma Onyenwe anyị na-ele anya nʼobi.”
8Jesi kpọrọ Abinadab ka ọ gafee nʼihu Samuel. Ma Samuel sịrị, “Onyenwe anyị ahọrọghị onye a.”
9Jesi mere ka Shama bịa gafee, ma Samuel sịrị, “Mba Onyenwe anyị ahọrọghị onye a.”
10Ụmụ ndị ikom Jesi asaa si otu a gafee nʼihu Samuel, ma Samuel sịrị ya, “Onyenwe anyị ahọrọghị ndị a.”